1Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya,
2Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị,
3Onye ajọ omume agaghị anọgide,
4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,
5Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi,
6Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ,
7Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi,
8Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ,
9Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu,
10Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,
11Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
12Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere,
13A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya,
14Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ,
15Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi,
16Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ,
17Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu,
18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha,
19Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi,
20Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ;
21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume,
22Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị,
23Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha,
24Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị,
25Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba,
26Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya,
27Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ,
28Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ,