1mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel,
2Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara
3“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha;
4Ha niile bụ ndị na-akwa iko;
5Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị,
6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha,
7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ.
8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ.
9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha,
10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide ya
11“Ifrem dịka nduru
12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha,
13Ahụhụ na-adịrị ha,
14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m,
15Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike,
16Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu.