1Lee ka ọlaedo si chuo echu.
2Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa,
3Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha
4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya
5Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche
6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu
7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,
8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.
9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma
10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere
11Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè;
12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị;
13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya,
14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile,
15Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!
16Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha.
17Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,
18Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere,
19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike
20Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ,
21Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm,
22Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala;