1Abụ m onye hụrụla ahụhụ site
2O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa
3Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m,
4O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ,
5O busola m agha,
6O meela ka m biri nʼọchịchịrị
7Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ;
8Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya,
9O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile,
10Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche,
11o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ,
12Ọ dọọla ụta ya
13O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya
14Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile;
15O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ,
16O meela ka m jiri okwute tajisie eze m,
17Enweghị m udo,
18Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.
19Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,
20Mgbe m na-echeta ya,
21Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m
22Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
23Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
24Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m,
25Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,
26Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ
27Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya
28Ya nọrọkwa duu naanị ya,
29Ya tinye ihu ya nʼaja,
30Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya,
31Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo
32Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya,
33Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ,
34Iji ụkwụ zọgbuo
35ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka
36ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ.
37Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire
38Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu
39Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu
40Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya.
41Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye
42“Anyị emehiela, nupu isi,
43“I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ.
44I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị
45I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ
46“Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha
47Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche,
48Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta
49Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta
50tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe
51Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu,
52Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla,
53Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu
54Mmiri kpuchiri m isi,
55Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị,
56Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị.
57Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị.
58Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m,
59Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m.
60Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile
61Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m
62Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m
63Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala.
64Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha,
65Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha.
66Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị,