We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Abụ Akwa 5

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Abụ Akwa 4 Abụ Akwa

1Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị;

2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka,

3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna.

4Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ.

5Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ,

6Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka

7Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla.

8Ndị bụ ohu na-achị anyị.

9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri,

10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ,5:10 Ite ọkụ a, bụ nke eji eghe ihe dịka achịcha maọbụ amịkpọ anụ na ihe ndị ọzọ

11Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn,

12Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu;

13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri,

14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama,

15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị;

16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ.

17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba,

18Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu,

19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.

20Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam?

21Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa;

22ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam

← Abụ Akwa 4 Abụ Akwa