1Job zara sị:
2“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.
3Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,
4Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,
5Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,
6Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,
7Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;
8Naanị ya gbasara mbara eluigwe,
9Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion
10Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,
11Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,
12Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?
13Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,
14“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,
15Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;
16A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,
17Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,
18Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi
19Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!
20A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;
21“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị
22Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,
23Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,
24Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,
25“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;
26Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,9:26 Ọ bụ nʼIjipt ka a na-eji ahịhịa papịrọs arụ ụgbọ epeepe. Ọpụ 2:3
27Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,
28Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu
29Ebe m bụrịị onye ikpe mara,
30A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m
31ị ga-enuba m nʼolulu apịtị
32“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,
33A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,
34onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,
35Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;