1“Ike ịdị ndụ agwụla m.
2Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,
3Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,
4Ị nwere anya nke anụ ahụ?
5Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,
6Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m
7Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,
8“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.10:8 Abụ 119:73; 139:13
9Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.
10Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi
11Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,
12I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,
13“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,
14Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,
15Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!
16Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ
17I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,
18“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?
19A sịkwarị na amụpụtaghị m
20Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?
21tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ
22Nʼala nke oke ọchịchịrị,