1Onyenwe anyị zara Job sị:
2“Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị?
3Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị:
4“Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị?
5Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ
6Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
7“Kwadoo onwe gị dịka dimkpa;
8“Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m?
9Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke?
10Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma,
11Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ,
12lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere,
13Likọta ha niile nʼotu nʼaja,
14Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị,
15“Lee enyi mmiri anya,
16Lee ike dị nʼukwu ya,
17Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida;
18Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị,
19Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke,
20Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri.
21Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri,
22Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya,
23Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu;
24Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya,