1“Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan
2Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya
3Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?
4Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ
5Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?
6Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?
7Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya
8Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka,
9Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya.
10Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe.
11Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ?
12“Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan,
13Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ?
14Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya,
15Azụ ya nwere ọta41:15 Mpako ya bụ ọta azụ ya ndị e doro nʼusoro
16nke ọbụla dị ibe ya nso,
17E jikọtara ha ọnụ nke ọma,
18Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;
19Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,
20Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,
21Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.
22Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,
23Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma,
24Obi ya dị ike dịka nkume,
25Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ;
26O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya,
27Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa;
28Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga,
29Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka,
30Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ,
31Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite;
32Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga;
33O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya,
34Ọ na-eleda ndị mpako niile anya.