1“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?
2Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,
3Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,
4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.
5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,
6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,
7Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,
8Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,
9Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.
10Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,
11Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,
12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,
13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,
14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,
15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;
16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,
18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;
19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,
20Akpanwa na-echefu ha,
21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,
22Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,
23Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,
24A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,
25“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha