1Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:
2“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;
3Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?
4Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?
5Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,
6ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,