1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
2“Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi
3Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,
4“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,
5Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,
6Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,
7ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;
8Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,
9Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,
10Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;
11Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa
12“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,
13ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,
14ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,
15Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;
16Ọ ga-amịcha elo agwọ,
17Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,
18Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.
19Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,
20“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;
21Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,
22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,
23Mgbe o rijuru afọ
24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,
25Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,
26Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,
27Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya
28Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;
29Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,