1Job zara sị:
2“Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ?
3Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m,
4A sịkwarị na m bụ onye mmehie,
5Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m,
6mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m,
7“Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata;
8Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe;
9O yipụla m ugwu m,
10Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara;
11Iwe ya dị ọkụ megide m;
12Ndị agha ya ji ike na-abịa;
13“O meela ka ụmụnne m
14Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m;
15Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ;
16Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m,
17Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide;
18Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo;
19Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ;
20Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ;
21“Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere,
22Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m?
23“Ọ gaara atọ m ụtọ
24na e ji mkpisi igwe dee ha,
25Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ,
26Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m,
27Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya,
28“Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya
29unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha;