1Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta;
2Ọ gaara adị m mma
3“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta,
4“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ.
5Enyi na-aghọgbu enyi ya,
6I bi nʼetiti aghụghọ.9:6 Ebe obibi gị bụ nʼetiti aghụghọ
7Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
8Ire ha na-egbu dịka àkụ.
9Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị,
10Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa.
11“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi.
12Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?
13Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.
14Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”
15Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi.
16Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.”
17Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
18Ha bịa ngwangwa
19Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn
20Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị,
21Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị
22Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
23Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
24kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a:
25“Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.
26Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”