1Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel.
2Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
3Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru.
4Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma,
5Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ,
6O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị.
7Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?
8Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.
9A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,
10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
11“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”
12Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.
13Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
14Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.
15Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,
16Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,
17Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,
18Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.
20Ebibiela ụlọ ikwu m,
21Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche.
22Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa,
23O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya,
24Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị,
25Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche