1Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn.
2“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya;
3Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha,
4“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
5Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn.
6“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu.
7Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha.
8“Sinụ na Babilọn gbalaga;
9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu,
10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha.
11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ,
12Ihere ga-eme nne unu,
13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,
14“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn,
15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile!
16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ
17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị,
18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha.
20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
21“Busonụ ala Merataim agha,
22A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ,
23Lee ka e si gbajie,
24Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn;
25Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya,
26Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha.
27Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile,
28Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ.
29“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn,
30Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile.
31“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.”
32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa,
33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru:
34Ma Onye mgbapụta ha dị ike.
35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,”
36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile.
37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha,
38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile
39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ.
40Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra,
41“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa;
42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe;
43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha,
44Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
45Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn,
46Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn,