We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Jeremaya 51

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Jeremaya 50 Jeremaya Jeremaya 52 →

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

2Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn,

3Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya,

4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn,

5Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma,

6“Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ.

7Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị.

8Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya.

9“ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn,

10“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè.

11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu;

12Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn.

13Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri,

14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị,

15“O sitere nʼike ya mee ụwa;

16Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.

17“Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.

18Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,

19Ma onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,

20“Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha,

21gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya,

22gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị,

23gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya,

24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.

25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe,

26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ,

27“Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ.

28Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha,

29Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu,

30Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ;

31Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya,

32na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi,

33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,

34“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị,

35Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.”

36Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,

37Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,

38Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm,

39Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha,

40“Aga m akpụdata ha,

41“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha,

42Osimiri ga-eri Babilọn,

43Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu,

44Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ,

45“Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m!

46Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ,

47Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa

48mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha

49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu,

50Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ,

51“Ihere emeela anyị,

52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,

53A sịkwarị51:53 Maọbụ, asịgodu na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe,

54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta,

55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi.

56Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha.

57Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke;

58Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

59Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya.

60Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn.

61Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya.

62Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’

63Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis.

64Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’ ”

← Jeremaya 50 Jeremaya Jeremaya 52 →