1Nke a dịrị Moab:
2Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ,
3Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim,
4A ga-etikpọ Moab,
5Ha ga-eji oke ịkwa akwa
6Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ!
7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu,
8Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile.
9Wụkwasị ala Moab nnu,
10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị.
11“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị,
12Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
13Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab,
14“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ;
15A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha.
16“Ọdịda Moab dị nso;
17Kasịenụ48:17 Maọbụ, ruo ụjụ maka ya ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu,
18“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata,
19Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ48:19 Ya bụ, Lee ihe na-eme,
20E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya.
21Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala,
22Dibọn, Nebo na Bet-Diblataim,
23Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon,
24Keriọt na Bozra,
25E bipụla mpi48:25 Ya bụ, ike Moab,
26“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke,
27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị?
28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume,
29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab.
30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla.
31Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab,
32Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị,
33Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ
34“A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha
35Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu,
36“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja.
37A kpụchapụla agịrị isi niile,
38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab,
39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike!
40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
41A ga-adọta Keriọt nʼagha,
42A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa,
43Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu,
44“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu
45“Nʼokpuru ndo Heshbọn
46Ahụhụ dịrị gị, gị Moab!
47“Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa,