1Mgbe ahụ, Job zara sị:
2“A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m
3Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri,
4Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m;
5Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata,
6A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu,
7A jụrụ m ịmetụ ya aka,
8“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,
9Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m
10Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,
11“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?
12Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?
13Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka,
14“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ
15Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha,
16nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi,
17Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị,
18Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha.
19Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri,
20Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi,
21Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru,
22O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m,
23gbapụtanụ m nʼaka ndị iro,
24“Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ,
25Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi!
26Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m?
27Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna,
28“Lezie m anya nke ọma,
29Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi,
30Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta?