1“Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị?
2Oke iwe na-egbu onye nzuzu,
3Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ,
4Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị,
5Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi;
6Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta,
7Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,5:7 14:1
8“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke;
9Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta,
10Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo,
11Ọ na-ebuli ndị dị ala elu,
12Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ,
13Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile,
14Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie,
15Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ,
16Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya,
17“Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị;
18Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha;
19Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii,
20Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ;
21Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.
22Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi,
23Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ,
24Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo;
25Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ,
26Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi,
27“Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu.