1“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba?
2Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada,
3otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya,
4Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’
5Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ;
6“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa,
7O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume;
8Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;
9Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,
10E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;
11“Ya mere agaghị m emechi ọnụ;
12A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri,
13Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi,
14nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu
15ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ,
16Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi.
17“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,
18i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,
19Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,
20Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,
21Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m,