1Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
2“Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?
3Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,
4Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,
5Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;
6Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,
7“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?
8Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka
9Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.
10Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,
11Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,
12“E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,
13Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,
14oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,
15Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.
16Ọ kwụsịrị;
17‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?
18Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,
19ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,
20Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:
21Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,