1Mmụọ m tiwara etiwa,
2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;
3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.
4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;
5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,
6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,
7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;
8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;
9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,
10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!
11Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.
12na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;
13Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,
14a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’
15ebeekwa ka olileanya m dị?
16Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?