1Mgbe ahụ, Job zara sị:
2“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a;
3Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị?
4Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu,
5Ma ọnụ m ga-agba unu ume;
6“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,
7Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,
8I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;
9Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,
10Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,
11Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,
12Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.
13ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.
14Mgbe niile, ọ na-emegide m;
15“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m,
16Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa,
17ma aka m emeghị ihe ike ọbụla,
18“Ala, biko, ezokwala ọbara m;
19Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe,
20Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m,
21Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke
22“Naanị afọ ole na ole ga-agabiga