We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Job 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Job 14 Job Job 16 →

1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:

2“Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi?

3Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka,

4Ma ị na-eleda ezi omume anya

5Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa;

6Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m,

7“Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ?

8Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke?

9Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị?

10Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị,

11Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta,

12Gịnị mere obi gị ji duhie gị,

13nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke,

14“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi,

15Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi,

16ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi,

17“Gee m ntị ka m kọwaara gị;

18bụ ihe ndị amamihe kwuru,

19bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha

20Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ,

21Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị,

22O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị;

23Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele;

24Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu,

25Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu,

26O ji ikwesi olu ike,

27“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya,

28ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi,

29Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa.

30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị,

31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu,

32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju,

33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha,

34Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga,

35Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume;

← Job 14 Job Job 16 →