1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala,
2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi,
3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya
4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,
5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka,
6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ,
7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;
8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.
9Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe;
10Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara;
11Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe,
12Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike?