1Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,
2Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha
3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,
4Onye ka unu na-akwa emo?
5Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ
6Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,57:6 Nkume ndị a na-akwọ mụrụmụrụ bụ ihe ha ji ejere chi ndị ahụ na-abụghị chi ozi.
7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,
8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,
9Ị were mmanụ jekwuru Molek57:9 Maọbụ, eze
10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,
11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?
12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,
13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,
14A ga-asịkwa,
15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu,
16Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị,
17Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha.
18Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha.
19Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha.
20Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị,
21“Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.