1“Geenụ ntị na nke a, unu agbụrụ Jekọb,
2Unu ndị na-akpa nganga na unu bụ ndị bi nʼobodo dị nsọ,
3Nʼoge gara aga ka m kwuru ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu.
4Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị isiike,
5Ọ bụ ya mere m ji buru ụzọ gwa unu nʼoge gara aga
6Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu,
7Ọ bụ ugbu a ka e kere ya, ọ bụghị na mgbe ochie.
8E, ị nụbeghị, ị maghịkwa,
9Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ
10Lee, anụchaalam unu, ma ọ bụghị dịka e si anụcha ọlaọcha nʼọkụ.
11Nʼihi mụ onwe m, e, nʼihi mụ onwe m, ka m na-eme nke a.
12“Geenụ m ntị, gị Jekọb,
13Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa.
14“Chịkọtaanụ onwe unu, unu niile, geenụ ntị.
15Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m ekwuola ya;
16“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a:
17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile,
19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja,
20Sitenụ na Babilọn pụọ,
21Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ.
22Onyenwe anyị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.”