1Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
2Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
3Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
4Ebe ị bụ ihe dị oke ọnụahịa nʼanya m,
5Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị.
6Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha,
7onye ọbụla nke a na-akpọ aha m,
8Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ,
9Mba niile dị iche iche ezukọtala,
10“Unu bụ ndị akaebe m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
11Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ Onyenwe anyị,
12Mụ onwe m egosila, zọpụta ma kwupụtakwa ya, mee ka unu nụrụ ya,
13“E, site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi, mụ onwe m bụ Chineke.
14Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
15Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị,
16Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
17Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta,
18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga;
19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime.
20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m,
21Ndị m kpụrụ nye onwe m,
22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb,
23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,
24Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ,
25“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu.
26Chetara m ihe gara aga,
27Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m.
28Ya mere, m ji menye ndị a maara aha ha nʼụlọnsọ ihere.