We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Aịzaya 30

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Aịzaya 29 Aịzaya Aịzaya 31 →

1“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,”30:1 Nke a bụ nʼihi mmekọrịta ha na ndị Ijipt 2Ez 18:21.

2Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka

3Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere,

4Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan

5ihere ga-eme onye ọbụla

6Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev.

7bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi.

8Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume,

9Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ

10Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ,

11Unu na-anọchiri anyị ụzọ,

12Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu,

13mmehie a ga-aghọrọ unu

14Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,

15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,

16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’

17Otu onye nʼime ndị iro unu

18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,

19Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.

20Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.

21Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”

22Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!”

23Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara.

24Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma.

25Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.

26Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.

27Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa!

28Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ,

29Ma unu ga-abụ abụ

30Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube,

31Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu;

32Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya,

33Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga.

← Aịzaya 29 Aịzaya Aịzaya 31 →