1Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ.
2Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile,
3O nweghị onye ọ ga-ahapụ.
4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ.
5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya;
6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa;
7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala,
8Egwu ụtọ niile akwụsịla,
9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa;
10Obodo atọgbọrọla nʼefu;
11Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa.
12Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe,
13Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile,
14Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ;
15Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto.
16Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa.
17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu,
18Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu
19Ụwa adapịasịala;
20Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu.
21Nʼụbọchị ahụ,
22A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ,
23Ọnwa ga-ada mba,