1Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ.
2Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara,
3Ndịisi unu niile agbapụchaala.22:3 Maọbụ, agbaala ọsọ
4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m;
5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị
6Elam bu akpa àkụ,
7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma;
8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda,
9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid
10Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ,
11Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ
12Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
13Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu;
14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
15Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru:
16Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike
17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka,
18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ,
19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị,
20“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya.
21Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna.
22Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ Devid. A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi,
23Aga m eme ka o guzosie ike dịka ǹtu a kpọgidere nʼaja ụlọ. Ocheeze ya ga-ewetara ụlọ nna ya nsọpụrụ.
24A ga-ekokwasị ya ebube nke ezinaụlọ ya, ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya, ihe niile nke dị nta, site na ite na efere, sitekwa nʼọba ruo na karama niile.
25“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Nʼoge ahụ, ǹtu ahụ a kpọgidesịrị ike nʼaja ụlọ ga-apụ nʼọnọdụ ya, a ga-akpajipụ ya ọ dapụ nʼala. Ibu niile nke kokwasịrị nʼelu ya ka a ga-egbuda nʼala.” Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.