1Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi;
2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha
3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?
4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,
5“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m.
6Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,
7Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere,
8Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
9‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish?
10Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị,
11Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị
12Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya.
13Nʼihi na ọ na-asị,
14Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,
15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,
16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ,
18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ
19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,
20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel,
21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ
22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,
23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela
24Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị,
25Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ,
26Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe
27Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe
28Ha erutela Ayịat;
29Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara;
30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim,
31Lee na Madmena nọ nʼọsọ,
32Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa;
33Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
34Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa.