1Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m,
2Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị,
3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,
4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu;
5Nʼezie, mmanya2:5 Nʼakwụkwọ ụfọdụ ihe ị ga-ahụ bụ akụnụba. na-eduhie ya ụzọ,
6“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya,
7Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede?
8Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche,
9“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ,
10I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ,
11Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị.
12“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo,
13Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị,
15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya,
16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere.
17Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị.
18“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya?
19Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’
20Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya.