1Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.
2Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị.
3Chineke si na Teman bịa,
4Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ,
5Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga,
6O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa;
7Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ,
8Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide?
9I kpughepụrụ ụta gị,
10Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha.
11Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe,
12I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa,
13Ị pụtara ịzọpụta ndị gị,
14Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi,
15Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri,
16Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile,
17A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
18mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
19Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m,