1Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn,
2Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha.
3Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan.
4Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke.
5Ụmụ ndị ikom Perez bụ,
6Zera mụrụ:
7Ekan nwa Kami,
8Etan mụrụ
9Hezrọn mụtara
10Ram mụrụ Aminadab,
11Nashọn mụrụ Salma,
12Boaz amụta Obed,
13Nwa nwoke mbụ Jesi mụrụ bụ
14Nke anọ bụ Netanel,
15nke isii Ozem,
16Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya,
17Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa.
18Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a
19Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
20Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.
21Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.
22Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead.
23Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
24Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa.
25Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya,
26Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam.
27Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a:
28Ụmụ Onam mụrụ bụ
29Abishua na nwunye ya Abihail mụrụ Aban, na Molid.
30Ụmụ Nadab mụrụ bụ
31Ma Apaim mụtara Ishi.
32Jada nwanne Shamai mụtara ụmụ ndị ikom abụọ,
33ma Jonatan mụtara ụmụ ndị ikom abụọ:
34Sheshan mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị, ma o nweghị nwa nwoke.
35O weere ada ya nwanyị nye odibo ya bụ Jaha, ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ mụtara ya otu nwa nwoke aha ya bụ Atai.
36Atai mụrụ Netan,
37Zabad amụọ Eflal.
38ma Obed mụrụ Jehu.
39Azaraya bụ nna Helez,
40Eleasa mụrụ Sismai,
41Shalum bụ nna Jekamaya,
42Ụmụ ndị ikom Kaleb nwanne Jerameel bụ
43Hebrọn mụrụ ndị a:
44Shema mụrụ Raham,
45Ọkpara Shamai bụ Maon,
46Efaa, iko nwanyị Kaleb,
47Jadia mụtara ndị ikom ndị a:
48Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a:
49ọ mụtakwara Shaaf, onye bụ nna Madmanna,
50Ndị a bụ ụmụ Kaleb.
51Salma nna Betlehem, na Haref, nna Bet-Gadea.
52Ụmụ Shobal nna Kiriat Jearim mụrụ bụ
53Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta.
54Salma mụtara ikwu ndị a:
55Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.