1Okwu Amụma.
2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;
3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,
4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,
7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,
8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,
9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!
10Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem,
11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,
12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.
13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,
15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.
16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya,
17Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!