1O Chineke, zọpụta m,
2Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi,
3Akpịrị akpọọla m nkụ;
4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu
5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;
6Ekwela ka ihere mee ndị
7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo,
8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ,
9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,
10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ,
11Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,
12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,
13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere,
14Dọpụta m site nʼụrụrọ,
15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,
16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,
17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị.
18Bịa m nso zọpụta m.
19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere:
20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi,
21Ha tinyere oluilu nʼime nri m,
22Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya;
23Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ,
24Wụkwasị ha oke iwe gị,
25Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu,
26Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ,
27Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume,
28Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ,
29Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu,
30Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,
31Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi,
32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ;
33Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa,
34Ka eluigwe na ụwa too ya,
35Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn;
36Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya,