1Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
2Bụọ abụ banyere ebube aha ya;
3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!
4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;
5Bịa lee ihe Chineke mere,
6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,66:6 Ọpụ 14:22
7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya,
8Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile,
9O chebela ndụ anyị,
10Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị;
11Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ,
12I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu;
13Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị,
14nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo,
15Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja,
16Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke;
17Eji m ọnụ m kpọkuo ya;
18Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m,
19ma Chineke gere ntị nʼezie,
20Otuto dịrị Chineke,