1Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
2Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m.
3Enyela ụmụ nwanyị31:3 Okwu a, ụmụ nwanyị, bụ banyere ọtụtụ ndị inyom bi nʼụlọeze. Onye dere akwụkwọ a, eleghị anya, na-arụtụ aka na ụmụ nwanyị ndị a, pụrụ ime ka uche eze pụọ site nʼihe o kwesiri ime. Est 2:3,8 ike gị,
4Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya.
5Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru.
6Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi,
7Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha,
8Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha;
9Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi.
10Nwanyị nwere ugwu31:10 Maọbụ, Nwanyị nwere agwa ọma na-ejidekwa onwe ya nʼụzọ kwesiri. onye ga-achọtali ya?
11Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,
12Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.
13Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi
14Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya
15Tupu chi abọzie,
16Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.
17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.
18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;
19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;
20Ọ na-agbasapụ aka
21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche
22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina,
23Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo31:23 Ọnụ ụzọ ama obodo bụ ebe ndị okenye na-ezukọta akparịta ụka. Jen 19:1; Rut 4:1-3
24Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu,
25Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.
26Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu
27Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya,
28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya;
29Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha,
30Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.
31E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara.