1Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,
2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,
3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,
4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,
5Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,
6Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu
7Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,
8Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,
9Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,
10Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,
11Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,
12Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,
13Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.
14Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,
15Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ
16Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;
17Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe
18Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,
19Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,
20Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,
21Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.
22Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya
23Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara
24Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,
25Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,
26Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!
27Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.
28Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha,