1Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ;
2Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa,
3Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile,
4Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume;
5Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;
6Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ,
7Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma,
8Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị,
9Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị,
10Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ.
11Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ;
12Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba,
13Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.
14Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe,
15Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị,
16Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,
17Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya,
18Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ;
19Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ,
20Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,
21Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya,
22Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala,
23Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,
24Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche,
25Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako,
26Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị
27Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu.
28Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya
29Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso;
30Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ.
31Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ
32Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị
33Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;