1Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha,
2Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike,
3Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị,
4Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu,
5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị,
6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.”
7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb?
8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m
9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m
10Bilienụ, pụọnụ,
11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị,
12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb,
13Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha.