1Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche.
2Nke dịrị Ijipt:
3“Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta,
4Kegidezienụ ịnyịnya unu,
5Gịnị ka anya m abụọ hụrụ?
6“Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga,
7“Onye bụ onye a, nke na-ebili46:7 Maọbụ, na-eruju ọtọ dịka osimiri Naịl,
8Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl,
9Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile.
10Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
11“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya,
12Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị.
13Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.
14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol.
15Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha?
16Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe,
17Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị,
18“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara,
19Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ,
20“Ijipt mara mma dịka nne ehi,
21Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha
22Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme,
23Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
24A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt,
25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.
26Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
27“Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.
28Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m,