1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke rutere Jeremaya banyere ụkọ mmiri.
2“Juda na-eru ụjụ,
3Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri.
4Ala na-agbawa
5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa,
6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị.
7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama,
8Gị, onye bụ olileanya Izrel.
9Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede,
10Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a,
11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a.
12Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”
13Ma asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Lee na ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha anya, maọbụ hụ ahụhụ nke ụnwụ na-eweta, nʼeziokwu, aga m enye unu udo nke na-adịgide adịgide nʼebe a.’ ”
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara.
15Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma nʼaha m. Ọ bụghị m ziteere ha, ma ha nọgidere na-asị, ‘Mma agha na ụnwụ enweghị ike ịbịaru ala a nso.’ Ndị amụma a niile ka a ga-ebibi site na mma agha na ụnwụ.
16A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.
17“Gwa ha okwu ndị a,
18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo
19Ị jụla Juda kpamkpam?
20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị,
21Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị.
22Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo?