1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
2“Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya
3Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa
4“Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?
5Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara,
6Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya,
7Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ,
8“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe38:8 Abụ 33:7; Abụ 104:9; Ilu 8:29; Jer 5:22
9mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe,
10mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị,
11mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya,
12“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu,
13ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka
14Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara;
15A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè,
16“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri,
17O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ?
18Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ?
19“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi?
20Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi?
21Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a!
22“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo,
23nke m chekwara nye oge nsogbu,
24Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe,
25Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo,
26Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị,
27ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri
28Mmiri ozuzo o nwere nna?
29Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta?
30nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume,
31“Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades?
32Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha
33Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe?
34“Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii
35Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha?
36Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ,
37Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ?
38mgbe aja dị nʼala siri ike,
39“Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri,
40mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha,
41Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya,