1“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie
2Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;
3Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,
4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile,
5“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha
6ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,
7Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,
8ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,
9“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,
10mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,
11Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,
12Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;31:12 Maọbụ, Mbibi
13“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi
14gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?
15Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?
16“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,
17ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,
18ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,
19Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,
20ma obi ha agọzighị m
21Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,
22mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,
23Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,
24“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,
25Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,
26ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,
27nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,
28mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,
29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m
30ekwebeghị m ka ọnụ m mehie
31Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.
32Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,
33Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,31:33 Maọbụ, dịka Adam mere
34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,
35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!
36Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,
37Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,
38“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m,
39ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,
40ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,