1Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
2“Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!
3Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!
4Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?
5“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,
6Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;
7Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.
8Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,
9Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,26:9 Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze nke ọnwa
10O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,
11Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,
12Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;
13Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;
14Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;26:14 Ihe ndị a bụ ụfọdụ nʼime ihe ọ na-eme