1“Mmadụ nke nwanyị mụrụ
2Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya,
3Ị na-elegide onye dị otu a anya?
4Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha?
5Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ;
6Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya
7“Ma olileanya dịịrị osisi;
8A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala,
9mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya,
10Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya;
11Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata,
12otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ;
13“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ,
14Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?
15Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị,
16Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ,
17A ga-ekechi njehie m nʼakpa,
18“Ma dịka ugwu si erichasi daa,
19dịka mmiri si akwọchasị nkume,
20Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga;
21Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a;
22Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama