1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
2“Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?
3Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?
4Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,
5Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,
6Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,
7“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke?
8Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime?
9Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa,
10“Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ,
11Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie,
12Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe
13“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya,
14ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka,
15mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị,
16Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị,
17Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie,
18Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;
19Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,
20Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada,